Isaiah 29

Ahụhụ dịrị obodo Devid

1Ahụhụ ga-adịrị gị, gị bụ Ariel, Ariel,
Nke a bụ aha ọzọ e ji mara Jerusalem.

gị obodo ebe Devid bi.
Gbakọnyenụ otu afọ nʼafọ ọzọ
nke unu ga-eji rie oriri, mee mmemme.
2Ma aga m akpagbu Ariel,
ọ ga-eru ụjụ, ma bee akwa,
ọ ga-adị ka ala ebe ịchụ aja.
3Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu,
aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburu
dokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị.
4Nʼọnọdụ mweda nʼala, ị ga-ekwu okwu site nʼala,
okwu ọnụ gị ga-esikwa nʼuzuzu pụta.
Olu gị ga-ada ka nke onye mmụọ site nʼala,
ọ bụ site nʼuzuzu ka okwu ọnụ gị na-ada ntakịrị ntakịrị ga-esi pụta.

5Ma igwe ndị iro gị
Ya bụ, ndị ala ọzọ na-emegide gị
ga-aghọ ntụ,
igwe ndị na-adịghị eme obi ebere ga-adịkwa ka igbugbo ọka nke ifufe na-ebufu.
Mgbe ahụ, na mberede,
6mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị,
Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji egbe eluigwe na ala ọma jijiji
na oke ifufe na oke ụzụ, na ọkụ na-erepịa erepịa, bịakwute ha.
7Mba niile ahụ, ndị na-ebuso Ariel agha,
bụ ndị na-ebuso ya na ebe ya e wusiri ike agha,
ga-efu dịka nrọ,
onye na-arahụ ụra nʼabalị rọrọ.
8Dịka mgbe onye agụụ na-agụ, nke na-arọ nrọ ebe ọ na-eri nri,
ma agụụ nọkwa na-agụ ya mgbe o si nʼụra teta.
Dịka onye agụụ mmiri na-agụ, nke nọ na nrọ hụ mmiri ọ na-aṅụ,
ma teta nʼụra chọpụta na akpịrị na-akpọsị ya nkụ ike, na-adakwa mba.
E, otu a ka ọ ga-adị
mgbe igwe ndị agha mba ahụ niile ga-ebuso ugwu Zayọn agha.

9Ka ọ gbagwojuo unu anya. Ka o jukwa unu anya.
Kpuonụ onwe unu ìsì ka unu ghara ịhụ ụzọ.
Ṅagharịanụ ma ọ bụghị site na mmanya unu ṅụrụ,
sọọnụ ngọngọ ma ọ bụghị site na mmanya na-aba nʼanya.
10Nʼihi na Onyenwe anyị awụkwasịla unu mmụọ nke oke ụra.
O mechiela anya ndị amụma unu niile,
kpuchie isi ndị niile na-ahụ ọhụ.
11Ihe ndị a niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu dịka akwụkwọ a kara akara. Mgbe e weere ya nye onye ma akwụkwọ ka ọ gụọ, ọ ga-asị, “Enweghị m ike, nʼihi na a kaala ya akara.” 12Mgbe e weere ya nye onye na-amaghị akwụkwọ, ọ ga-asị, “Ewela iwe, amaghị m agụ.”

13Onyenwe anyị sịrị,

“Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso,
ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m,
ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.
Ofufe ha na-efe m, bụ nke
gbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha.
14Ya mere, otu ugboro ọzọ, aga m eme ndị a ihe oke iju anya
jiri ihe ịtụnanya tụkwasị nʼelu ihe ịtụnanya,
amamihe nke ndị maara ihe ga-ala nʼiyi,
nghọta nke ndị nwere nghọta ga-agba barịị.”
15Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eche
na ha na-ezonarị Onyenwe anyị nzube ha,
ndị na-agbalịsị ike ime ihe ha zubere na nzuzo, ma na-asịrịta onwe ha,
“Chineke agaghị ahụ anyị. Ọ maghị ihe anyị na-eme!”
16Lee ka unu si ekpu ihe ihu nʼala,
Ka unu si bụrụ ndị nzuzu

ka a ga-asị na ọkpụ ite dị ka ụrọ e ji akpụ ite.
Ihe mmadụ kpụrụ o nwere ike ịtụgharị gwa onye kpụrụ ya, sị,
“Ị kpụghị m”?
Ka ite o nwere ike ị sị ọkpụ ite,
“Ị ghọtaghị ihe ọbụla”?

17Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe,
ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa?
18Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ,
ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha,
hụkwa ụzọ ọzọ.
19Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọ
nke Onyenwe anyị Onye dị nsọ nke Izrel na-enye.
20Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa;
ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa,
ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha,
21bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara,
ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya,
ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka.
22Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb,

“Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ.
Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ.
23Mgbe ha hụrụ ụmụ ha,
bụ ọrụ aka m abụọ, nʼetiti ha,
ha ga-edo aha m nsọ,
ha ga-ekwupụta, nabatakwa ịdị nsọ nke Onye nsọ Jekọb,
ha ga-eguzokwa nʼihu Chineke Izrel nʼegwu na nʼịma jijiji.
24Ndị na-akpafu nʼime mmụọ ha ga-enweta nghọta,
ndị ntamu ga-achọkwa ka ha mụta ihe.”
Copyright information for IboBIU